Psalms 4

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ.

Ntụgharị uche nke abalị

1Zaa m mgbe m na-akpọku gị
Chineke m, gị onye ezi omume;
Napụta m site nʼihe mgbu m,
meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.

2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?
Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?
Nke unu maara na ha bụ okwu ụgha
Sela
3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela
5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,
chụkwaranụ ya aja ezi omume.

6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”
Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
7Were ọṅụ mejupụta obi m
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.

8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,
nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,
na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
Copyright information for IboBIU